1Nʼoge ahụ, mgbe ọtụtụ puku ndị mmadụ gbakọtara, nke mere ka ha na-azọ ibe ha ụkwụ. O buuru ụzọ bido ịgwa ndị na-eso ụzọ ya sị, “Kpacharanụ anya unu banyere ihe na-eko achịcha ndị Farisii, nke bụ ihu abụọ ha.
2Nʼihi na ọ dịghị ihe ọbụla zoro ezo nke na-agaghị apụta ìhè, ọ dịkwaghị ihe e kpuchiri ekpuchi nke a na-agaghị ekpughe.
3Ihe ọbụla unu kwuru nʼọchịchịrị, a ga-anụ ya nʼihe, ihe ọbụla unu gbara nʼizu nʼime ụlọ ka a ga-ekwusa nʼelu ụlọ.