1Nʼoge ahụ, mgbe ọtụtụ puku ndị mmadụ gbakọtara, nke mere ka ha na-azọ ibe ha ụkwụ. O buuru ụzọ bido ịgwa ndị na-eso ụzọ ya sị, “Kpacharanụ anya unu banyere ihe na-eko achịcha ndị Farisii, nke bụ ihu abụọ ha.
2Nʼihi na ọ dịghị ihe ọbụla zoro ezo nke na-agaghị apụta ìhè, ọ dịkwaghị ihe e kpuchiri ekpuchi nke a na-agaghị ekpughe.
3Ihe ọbụla unu kwuru nʼọchịchịrị, a ga-anụ ya nʼihe, ihe ọbụla unu gbara nʼizu nʼime ụlọ ka a ga-ekwusa nʼelu ụlọ.
4“Ana m agwa unu, ndị enyi m, unu atụla egwu maka ndị na-egbu anụ ahụ ma e mesịa, ha apụghị ime ihe ọzọ.
5Ma aga m ezi unu onye unu ga-atụ egwu. Tụọnụ egwu Onye ahụ nwere ikike igbu anụ ahụ ma tụbakwa ya nʼọkụ ala mmụọ. E, asị m unu tụọnụ ya egwu.