4Gbaghara anyị mmehie anyị, nʼihi na anyị na-agbaghara onye ọbụla mehiere megide anyị. Ekwela ka anyị daba nʼime ọnwụnwa.’ ”
5Ọ sịrị ha, “Onye nʼime unu nwere enyi, ga-agakwuru ya nʼetiti abalị sị ya, ‘Enyi m, biko gbazinye m ogbe achịcha atọ,
6nʼihi na otu enyi m bịara nʼụlọ m, ma enweghị m nri ọbụla nʼụlọ m nke m ga-enye ya.’
7Ma ọ ga-esi nʼime ụlọ zaghachi sị, ‘Enyela m nsogbu, emechiela m ụzọ, mụ na ụmụ m alakpuola, enweghị m ike ibili ugbu a inye gị ihe ọbụla.’
8Agwa m unu, ọ bụ ezie na ọ gaghị ebili nye ya ihe ọbụla nʼihi na ọ bụ enyi ya, kama nʼihi nsogbu ya, ọ ga-ebili nye ya ihe ọbụla dị ya mkpa.