Luk 12

“Otu a ka ọ ga-adịrị onye ọbụla na-akpadoro naanị onwe ya akụ, ma ọ baghị ụba nʼebe Chineke nọ.”

Luke 12:21 (UKJV) So is he that lays up treasure for himself, and is not rich toward God.

19Ya mere aga m agwa mkpụrụobi m, “I nwere ọtụtụ ezi ihe ga-ezuru gị ọtụtụ afọ, nʼihi ya zuru ike, rie, ṅụọ ma nweekwa obi ụtọ.” ’

20“Ma Chineke gwara ya sị, ‘Onye nzuzu, nʼabalị a ka a ga-achọ mkpụrụobi gị nʼaka gị. Ihe niile ị kpakọtara nke onye ka ha ga-abụ?’

21“Otu a ka ọ ga-adịrị onye ọbụla na-akpadoro naanị onwe ya akụ, ma ọ baghị ụba nʼebe Chineke nọ.”

22Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, “Ya mere, asị m unu, unu echegbula onwe unu banyere ndụ unu, ihe unu ga-eri, maọbụ banyere ahụ unu, ihe unu ga-eyi.

23Nʼihi na ndụ dị mkpa karịa ihe oriri, anụ ahụ dịkwa mkpa karịa uwe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.