20“Ma Chineke gwara ya sị, ‘Onye nzuzu, nʼabalị a ka a ga-achọ mkpụrụobi gị nʼaka gị. Ihe niile ị kpakọtara nke onye ka ha ga-abụ?’
21“Otu a ka ọ ga-adịrị onye ọbụla na-akpadoro naanị onwe ya akụ, ma ọ baghị ụba nʼebe Chineke nọ.”
22Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, “Ya mere, asị m unu, unu echegbula onwe unu banyere ndụ unu, ihe unu ga-eri, maọbụ banyere ahụ unu, ihe unu ga-eyi.
23Nʼihi na ndụ dị mkpa karịa ihe oriri, anụ ahụ dịkwa mkpa karịa uwe.
24Tuleenụ ugolọma. Ha adịghị akụ maọbụ ghọrọ mkpụrụ ọbụla. Ha enweghị ụlọakụ maọbụ ọba, ma Chineke na-azụ ha nri. Unu ọ dịghị oke ọnụahịa karịa anụ ufe ndị a.