Luk 12

Pita sịrị ya, “Onyenwe anyị, ị tụrụ ilu a nʼihi anyị, ka ọ bụ maka onye ọbụla?”

Luke 12:41 (UKJV) Then Peter said unto him, Lord, speak you this parable unto us, or even to all?

39Maranụ nke a: ọ bụrụ na onyenwe ụlọ maara oge awa onye ohi ga-eji abịa nʼụlọ ya, ọ gaghị ekwe ka onye ohi ahụ tiwaa ụlọ ya.

40Unu kwesiri ịnọ na njikere nʼihi na Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼoge awa unu na-atụghị anya ya.”

41Pita sịrị ya, “Onyenwe anyị, ị tụrụ ilu a nʼihi anyị, ka ọ bụ maka onye ọbụla?”

42Ma Onyenwe anyị sịrị, “Onye bụ ohu ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi ma nwekwa uche, nke onyenwe ya mere onyeisi ụmụodibo ya niile, ka ọ na-enye ha nri mgbe o kwesiri?

43Ngọzị na-adịrị ohu ahụ nke onyenwe ya ga-ahụ ka ọ na-arụ ọrụ ahụ mgbe ọ ga-alọghachi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.