Luk 12

Unu kwesiri ịnọ na njikere nʼihi na Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼoge awa unu na-atụghị anya ya.”

Luke 12:40 (UKJV) Be all of you therefore ready also: for the Son of man comes at an hour when all of you think not.

38Ngọzị ga-adịrị ndị ohu ahụ onye nwe ha ga-ahụ ka ha nọ na njikere, ọ bụladị ma ọ lọghachiri nʼetiti abalị, maọbụ nʼezigbo isi ụtụtụ.

39Maranụ nke a: ọ bụrụ na onyenwe ụlọ maara oge awa onye ohi ga-eji abịa nʼụlọ ya, ọ gaghị ekwe ka onye ohi ahụ tiwaa ụlọ ya.

40Unu kwesiri ịnọ na njikere nʼihi na Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼoge awa unu na-atụghị anya ya.”

41Pita sịrị ya, “Onyenwe anyị, ị tụrụ ilu a nʼihi anyị, ka ọ bụ maka onye ọbụla?”

42Ma Onyenwe anyị sịrị, “Onye bụ ohu ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi ma nwekwa uche, nke onyenwe ya mere onyeisi ụmụodibo ya niile, ka ọ na-enye ha nri mgbe o kwesiri?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.