44Nʼezie asị m unu, ọ ga-eme onye nke ahụ onyeisi nke ihe niile o nwere.
45Ma ọ bụrụ na ohu ahụ asị nʼobi ya, ‘Onyenwe m na-anọ ọdụ ịlọta,’ ọ bụrụkwa na ọ malite itigbu ụmụodibo ndị ọzọ, bụ ndị ikom na ndị inyom na-eje ozi, na iri ihe oriri, na ịṅụkwa ihe ọṅụṅụ na ịṅụbiga mmanya oke.
46Nna ukwu ohu ahụ ga-alọta nʼụbọchị ọ na-atụghị anya, nʼoge awa ọ na-amakwaghị. Ọ ga-egburisikwa ya, nye ya ọnọdụ nʼetiti ndị na-ekweghị ekwe.
47“Ohu ahụ maara ihe nna ya ukwu chọrọ ma hapụ ịnọ na njikere, maọbụ ime ya, ka a ga-apịasi ụtarị ike.
48Ma onye na-amaghị ama ma mee ihe kwesiri ka a pịa ya ụtarị, a ga-apịa ya ụtarị ole na ole. Nʼihi na ọ bụ onye e nyere ihe hiri nne ka a ga-ele anya ịnata ihe hiri nne nʼaka. Onye e nyekwara ihe ukwu nʼaka idebe, nʼaka ya ka a ga-achọ ihe nke kachasịnụ.