42Ma Onyenwe anyị sịrị, “Onye bụ ohu ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi ma nwekwa uche, nke onyenwe ya mere onyeisi ụmụodibo ya niile, ka ọ na-enye ha nri mgbe o kwesiri?
43Ngọzị na-adịrị ohu ahụ nke onyenwe ya ga-ahụ ka ọ na-arụ ọrụ ahụ mgbe ọ ga-alọghachi.
44Nʼezie asị m unu, ọ ga-eme onye nke ahụ onyeisi nke ihe niile o nwere.
45Ma ọ bụrụ na ohu ahụ asị nʼobi ya, ‘Onyenwe m na-anọ ọdụ ịlọta,’ ọ bụrụkwa na ọ malite itigbu ụmụodibo ndị ọzọ, bụ ndị ikom na ndị inyom na-eje ozi, na iri ihe oriri, na ịṅụkwa ihe ọṅụṅụ na ịṅụbiga mmanya oke.
46Nna ukwu ohu ahụ ga-alọta nʼụbọchị ọ na-atụghị anya, nʼoge awa ọ na-amakwaghị. Ọ ga-egburisikwa ya, nye ya ọnọdụ nʼetiti ndị na-ekweghị ekwe.