5Ma aga m ezi unu onye unu ga-atụ egwu. Tụọnụ egwu Onye ahụ nwere ikike igbu anụ ahụ ma tụbakwa ya nʼọkụ ala mmụọ. E, asị m unu tụọnụ ya egwu.
6Ọ bụghị mkpụrụ ego abụọ ka a na-ere ụmụ nza ise? Ma o nweghị nke ọbụla nʼime ha Chineke chefuru.
7Nʼezie a gụrụ ọ bụladị agịrị isi dị nʼisi unu ọnụ. Unu atụla egwu, nʼihi na unu dị oke ọnụ karịa ọtụtụ ụmụ nza.
8“Ma asị m unu, na onye ọbụla kwupụtara m nʼihu ụmụ mmadụ, onye ahụ ka Nwa nke Mmadụ ga-ekwupụta nʼihu ndị mmụọ ozi nke Chineke.
9Onye ọbụla na-agọnarị m nʼihu ndị mmadụ, a ga-agọnarịkwa ya nʼihu ndị mmụọ ozi nke Chineke.