7Nʼezie a gụrụ ọ bụladị agịrị isi dị nʼisi unu ọnụ. Unu atụla egwu, nʼihi na unu dị oke ọnụ karịa ọtụtụ ụmụ nza.
8“Ma asị m unu, na onye ọbụla kwupụtara m nʼihu ụmụ mmadụ, onye ahụ ka Nwa nke Mmadụ ga-ekwupụta nʼihu ndị mmụọ ozi nke Chineke.
9Onye ọbụla na-agọnarị m nʼihu ndị mmadụ, a ga-agọnarịkwa ya nʼihu ndị mmụọ ozi nke Chineke.
10Onye ọbụla nke ga-ekwu okwu megide Nwa nke Mmadụ, a ga-agbaghara ya, ma onye ọbụla na-ekwulu Mmụọ Nsọ, agaghị agbaghara ya.
11“Mgbe ha ga-akpọbata unu nʼihu ụlọ nzukọ, ndị ọchịchị na ndịisi, unu echegbula onwe unu otu unu ga-esi zaghachi, maọbụ ihe unu ga-aza, maọbụ ihe unu ga-ekwu.