9Ọ bụrụ na ọ mịa mkpụrụ nʼafọ ọzọ, ọ dị mma, ọ bụrụkwa na ọ mịghị, i nwere ike gbutuo ya. ’ ”
10Nʼụbọchị izuike ndị Juu, ọ banyere nʼime otu ụlọ ekpere na-ezi ihe.
11Otu nwanyị nọkwa nʼebe ahụ, onye mmụọ nrịa nrịa mere ka ahụ ghara ị dị ya ike afọ iri na asatọ. Ọ na-ehu ehu, o nwekwaghị ike iguzo ọtọ kwem.
12Mgbe Jisọs hụrụ ya, ọ kpọrọ ya sị ya, “Nwanyị emeela ka i nwere onwe gị site nʼọrịa gị.”
13Mgbe o bikwasịrị ya aka, ngwangwa, o guzooro kwem malite na-eto Chineke.