10Nʼụbọchị izuike ndị Juu, ọ banyere nʼime otu ụlọ ekpere na-ezi ihe.
11Otu nwanyị nọkwa nʼebe ahụ, onye mmụọ nrịa nrịa mere ka ahụ ghara ị dị ya ike afọ iri na asatọ. Ọ na-ehu ehu, o nwekwaghị ike iguzo ọtọ kwem.
12Mgbe Jisọs hụrụ ya, ọ kpọrọ ya sị ya, “Nwanyị emeela ka i nwere onwe gị site nʼọrịa gị.”
13Mgbe o bikwasịrị ya aka, ngwangwa, o guzooro kwem malite na-eto Chineke.
14Ma onyendu ụlọ ekpere ahụ were iwe nke ukwuu nʼihi na Jisọs gwọrọ ọrịa nʼụbọchị izuike. Ọ gwara igwe mmadụ ahụ okwu sị, “E nwere ụbọchị isii nʼime izu ụka mgbe mmadụ kwesiri ịrụ ọrụ. Ya mere, bịanụ ka a gwọọ unu nʼụbọchị ndị a, ọ bụghị nʼụbọchị izuike.”