19O yiri mkpụrụ mọstaadị nke mmadụ kụrụ nʼubi ya a gbara ogige. O toro ghọọ osisi, nke ụmụ nnụnụ na-ezukwa ike nʼalaka ya.”
20Ọzọ, ọ sịrị, “Gịnị ka m ga-eji tụnyere alaeze Chineke?
21Ọ dị ka ihe na-eko achịcha nke nwanyị gwakọtara na ọtụtụ atọ nke ụtụ ọka, tutu ruo mgbe o koro ụtụ ọka ahụ niile.”
22O jegharịrị nʼobodo ukwu na nʼobodo nta niile na-ezi ihe, ka ọ na-aga Jerusalem.
23Otu onye sịrị ya, “Onyenwe m, ndị a ga-azọpụta ha ga-adị ole na ole?” Ọ sịrị ha,