27“Ma ọ ga-asị, ‘Amaghị m ebe unu siri bịa. Pụọnụ nʼihu m, unu ndị ajọ omume.’
28“Ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adịkwa mgbe unu ga-ahụ Ebraham, na Aịzik na Jekọb na ndị amụma niile ka ha nọ nʼalaeze Chineke; ma unu onwe unu abụrụ ndị a chụpụrụ nʼezi.
29Ndị mmadụ ga-esite nʼọwụwa anyanwụ, nakwa ọdịda anyanwụ, na nʼugwu na ndịda nke ụwa bịa nọdụ nʼoriri nʼime alaeze Chineke.
30Ma lee, ndị bu ụzọ ga-aghọ ndị ikpeazụ, ma ndị ikpeazụ ga-aghọ ndị bu ụzọ.”
31Nʼoge awa ahụ, ụfọdụ ndị Farisii bịakwutere ya sị ya, “Si nʼebe a pụọ, nʼihi na Herọd na-achọ igbu gị.”