3Jisọs jụrụ ndị Farisii na ndị ozizi iwu sị, “O ziri ezi nʼiwu ịgwọ ọrịa nʼụbọchị izuike ka ọ bụ na o zighị?”
4Ma ha e kwughị okwu ọbụla. Ya mere ọ kpọrọ ya, gwọọ ya ma sị ya laa.
5Ọ sịrị ha, “Ọ bụrụ na otu nʼime unu nwere nwa nwoke maọbụ oke ehi nke dabara nʼime olulu mmiri nʼụbọchị izuike, ọ bụ na ọ gaghị eme ngwangwa dọpụta ya?”
6Ma ha enweghị ike ịza ajụjụ a.
7Mgbe ọ hụrụ otu ndị a kpọrọ oriri si họrọ naanị oche ndị a na-asọpụrụ, oche ndị a na-asọpụrụ, ọ tụrụ ha ilu sị,