11O kwukwaara sị, “Otu nwoke mụtara ụmụ nwoke abụọ.
12Nwa ya nke nta sịrị nna ya, ‘Nna, kenye m oke ruuru m nʼihe niile i nwere.’ Ya mere, o kenyere ya oke nke ya site nʼihe o nwere.
13“Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, nwokorobịa ahụ kwakọtara ihe niile o nwere gaa biri nʼotu obodo dị anya. Nʼebe ahụ, o mefuchara ihe niile o nwere nʼibi ndụ ọjọọ.
14Mgbe o mefuchara ihe niile o nwere, oke ụnwụ dara nʼala ahụ. Ọ malitere ịnọ nʼụkọ.
15Nʼihi nke a, ọ gara binyere otu onye obodo ahụ nyere ya ọrụ ilekọta ezi ya na inye ha nri.