15Nʼihi nke a, ọ gara binyere otu onye obodo ahụ nyere ya ọrụ ilekọta ezi ya na inye ha nri.
16Ma ọ na-agụ ya ka o site na nri ọ na-enye ezi rijuo afọ, ma ọ dịghị onye nyere ya ụdị nri ahụ.
17“Mgbe ọ ghọtara onwe ya, ọ sịrị, ‘Mmadụ ole bụ ndị ọrụ e goro ego nna m nwere, ndị nri na-ezuru ma mapụtakwa, ma agụụ na-egbu m nʼebe a.
18Aga m ebili lakwuru nna m, sị ya, Nna, emehiela m megide eluigwe na gị onwe gị.
19Ekwesikwaghị m ka a kpọọ m nwa gị ọzọ, were m dị ka otu nʼime ndị i goro ọrụ.’