17“Mgbe ọ ghọtara onwe ya, ọ sịrị, ‘Mmadụ ole bụ ndị ọrụ e goro ego nna m nwere, ndị nri na-ezuru ma mapụtakwa, ma agụụ na-egbu m nʼebe a.
18Aga m ebili lakwuru nna m, sị ya, Nna, emehiela m megide eluigwe na gị onwe gị.
19Ekwesikwaghị m ka a kpọọ m nwa gị ọzọ, were m dị ka otu nʼime ndị i goro ọrụ.’
20Ya mere, o biliri laghachikwuru nna ya. “Ma mgbe ọ nọrịị nʼebe dị anya, nna ya hụrụ ya, nwee ọmịiko nʼahụ ya, gbaara ọsọ ga makụọ ya, sutukwa ya ọnụ.
21“Nwa ya nwoke ahụ sịrị ya, ‘Nna, emehiela m megide eluigwe na gị onwe gị. Ekwesighị m ka a kpọọ m nwa gị ọzọ.’