Luk 15

“Nwa ya nwoke ahụ sịrị ya, ‘Nna, emehiela m megide eluigwe na gị onwe gị. Ekwesighị m ka a kpọọ m nwa gị ọzọ.’

Luke 15:21 (UKJV) And the son said unto him, Father, I have sinned against heaven, and in your sight, and am no more worthy to be called your son.

19Ekwesikwaghị m ka a kpọọ m nwa gị ọzọ, were m dị ka otu nʼime ndị i goro ọrụ.’

20Ya mere, o biliri laghachikwuru nna ya. “Ma mgbe ọ nọrịị nʼebe dị anya, nna ya hụrụ ya, nwee ọmịiko nʼahụ ya, gbaara ọsọ ga makụọ ya, sutukwa ya ọnụ.

21“Nwa ya nwoke ahụ sịrị ya, ‘Nna, emehiela m megide eluigwe na gị onwe gị. Ekwesighị m ka a kpọọ m nwa gị ọzọ.’

22“Ma nna ya gwara ndị ohu ya sị, ‘Meenụ ngwangwa weta uwe kachasị mma yikwasị ya. Gbanye ya ọlaaka nʼaka, yinyekwanụ ya akpụkpọụkwụ nʼụkwụ.

23Gaanụ kpụpụta nwa ehi gbara abụba, gbuo ya, ka anyị rie ma ṅụrịakwa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.