Luk 15

Ma ugbu a, nwa gị a, onye ya na ndị akwụna mefuru akụ gị alọtala, ya ka i gburu nwa ehi gbara abụba.’

Luke 15:30 (UKJV) But as soon as this your son was come, which has devoured your living with harlots, you have killed for him the fatted calf.

28“Iwe were ya, ọ jụrụ ịbata nʼime ụlọ. Nna ya pụtara nʼezi rịọ ya arịrịọ.

29Ma ọ zara nna ya sị, ‘Lee ọtụtụ afọ niile ndị a ka m nọọ na-ejere gị ozi, enupukwaghị m isi nʼiwu gị nʼụzọ ọbụla. Ma o nweghị oge i nyere m ọ bụladị nwa ewu sị mụ na ndị enyi m jiri ya mee oriri.

30Ma ugbu a, nwa gị a, onye ya na ndị akwụna mefuru akụ gị alọtala, ya ka i gburu nwa ehi gbara abụba.’

31“Ma ọ sịrị ya, ‘Nwa m, mụ na gị nọ mgbe niile, ihe niile m nwere bụkwa nke gị.

32Ma anyị kwesiri ịṅụrị ọṅụ, kpọọkwa oriri, nʼihi na nwanne gị nwoke a nwụrụ anwụ ma ọ dịla ndụ ọzọ. O fukwara efu ma a chọtala ya. ’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.