27Ọ sịrị ya, ‘Nwanne gị nwoke alọtala. Nna gị egbuola nwa ehi gbara abụba nʼihi na ọ lọtara nʼudo na ahụ ike.’
28“Iwe were ya, ọ jụrụ ịbata nʼime ụlọ. Nna ya pụtara nʼezi rịọ ya arịrịọ.
29Ma ọ zara nna ya sị, ‘Lee ọtụtụ afọ niile ndị a ka m nọọ na-ejere gị ozi, enupukwaghị m isi nʼiwu gị nʼụzọ ọbụla. Ma o nweghị oge i nyere m ọ bụladị nwa ewu sị mụ na ndị enyi m jiri ya mee oriri.
30Ma ugbu a, nwa gị a, onye ya na ndị akwụna mefuru akụ gị alọtala, ya ka i gburu nwa ehi gbara abụba.’
31“Ma ọ sịrị ya, ‘Nwa m, mụ na gị nọ mgbe niile, ihe niile m nwere bụkwa nke gị.