Luk 15

Ọ sịrị ya, ‘Nwanne gị nwoke alọtala. Nna gị egbuola nwa ehi gbara abụba nʼihi na ọ lọtara nʼudo na ahụ ike.’

Luke 15:27 (UKJV) And he said unto him, Your brother has come; and your father has killed the fatted calf, because he has received him safe and sound.

25“Ọ dịghị anya, nwa ya nke okenye, onye jere ịrụ ọrụ nʼubi, mgbe ọ na-abịaru ụlọ nso, ọ nụrụ ụda egwu na ịgba egwu.

26Ọ kpọrọ otu nʼime ndị ohu jụọ ya ihe na-eme.

27Ọ sịrị ya, ‘Nwanne gị nwoke alọtala. Nna gị egbuola nwa ehi gbara abụba nʼihi na ọ lọtara nʼudo na ahụ ike.’

28“Iwe were ya, ọ jụrụ ịbata nʼime ụlọ. Nna ya pụtara nʼezi rịọ ya arịrịọ.

29Ma ọ zara nna ya sị, ‘Lee ọtụtụ afọ niile ndị a ka m nọọ na-ejere gị ozi, enupukwaghị m isi nʼiwu gị nʼụzọ ọbụla. Ma o nweghị oge i nyere m ọ bụladị nwa ewu sị mụ na ndị enyi m jiri ya mee oriri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.