23Nʼọkụ ala mmụọ ebe onye ọgaranya ahụ nọ nʼoke ihe mgbu, ọ hụrụ Ebraham ka ọ nọ nʼebe dị anya, hụkwa Lazarọs nʼakụkụ ya.
24Ọ kpọkuru Ebraham sị ya, ‘Nna m Ebraham, meere m ebere nʼihi na anọ m nʼoke ihe mgbu nʼime ọkụ a. Biko zienụ Lazarọs ka ọ denye mkpịsịaka ntakịrị ya na mmiri bịa mejụọ ire m.’
25“Ma Ebraham sịrị ya, ‘Nwa m, chetakwa na ị nara ezi ihe gị mgbe ị dị ndụ, ebe Lazarọs nara ihe ọjọọ. Ma ugbu a, a na-akasị ya obi nʼebe a ma gị onwe gị nọkwa nʼahụhụ.
26A sịkwarị na anyị achọọ inyere gị aka, ọ gaghị ekwe mee nʼihi na e nwere olulu dị ukwuu kewara anyị na unu. Mmadụ ọbụla enwekwaghị ike isite nʼebe a bịa nʼebe unu nọ, ọ dịkwaghị onye nwere ike isite nʼebe ahụ unu nọ bịa nʼebe a.’
27“Ọ sịrị, ‘Ya mere, arịọ m gị nna, ziganụ ya nʼụlọ nna m,