25“Ma Ebraham sịrị ya, ‘Nwa m, chetakwa na ị nara ezi ihe gị mgbe ị dị ndụ, ebe Lazarọs nara ihe ọjọọ. Ma ugbu a, a na-akasị ya obi nʼebe a ma gị onwe gị nọkwa nʼahụhụ.
26A sịkwarị na anyị achọọ inyere gị aka, ọ gaghị ekwe mee nʼihi na e nwere olulu dị ukwuu kewara anyị na unu. Mmadụ ọbụla enwekwaghị ike isite nʼebe a bịa nʼebe unu nọ, ọ dịkwaghị onye nwere ike isite nʼebe ahụ unu nọ bịa nʼebe a.’
27“Ọ sịrị, ‘Ya mere, arịọ m gị nna, ziganụ ya nʼụlọ nna m,
28nʼihi na enwere m ụmụnne nwoke ise. Ka ọ dọọ ha aka na ntị ka ha ghara ịbịa nʼebe a mmekpa ahụ dị.’
29“Ebraham sịrị, ‘Ha nwere Mosis na ndị amụma, ha gee ha ntị.’