26A sịkwarị na anyị achọọ inyere gị aka, ọ gaghị ekwe mee nʼihi na e nwere olulu dị ukwuu kewara anyị na unu. Mmadụ ọbụla enwekwaghị ike isite nʼebe a bịa nʼebe unu nọ, ọ dịkwaghị onye nwere ike isite nʼebe ahụ unu nọ bịa nʼebe a.’
27“Ọ sịrị, ‘Ya mere, arịọ m gị nna, ziganụ ya nʼụlọ nna m,
28nʼihi na enwere m ụmụnne nwoke ise. Ka ọ dọọ ha aka na ntị ka ha ghara ịbịa nʼebe a mmekpa ahụ dị.’
29“Ebraham sịrị, ‘Ha nwere Mosis na ndị amụma, ha gee ha ntị.’
30“Ma o kwuru, ‘Nna Ebraham, nke ahụ agaghị ezu! A sị na otu onye ga-esi nʼala ndị nwụrụ anwụ gakwuru ha, ha ga-echegharị.’