9Ọ ga-ekele ohu ahụ nʼihi na ọ rụrụ ọrụ o kwesiri ịrụ?
10Nʼotu aka ahụ, mgbe unu rụchara ọrụ niile unu kwesiri ịrụ, ihe unu ga-ekwu bụ, ‘Anyị bụ ụmụ ohu na-ekwesighị ekwesi, anyị emeela ihe anyị kwesiri ime.’ ”
11Ka ọ na-aga Jerusalem, o sitere nʼụzọ dị nʼagbata Sameria na Galili.
12Mgbe ọ banyere nʼotu obodo nta, ndị ekpenta iri sitere nʼebe dị anya zute ya.
13Ha tiri mkpu nʼoke olu sị, “Jisọs nna anyị ukwuu, mere anyị ebere.”