Luk 17

“Dị ka ọ dị nʼụbọchị Noa, otu a ka ọ ga-adịkwa nʼụbọchị Nwa nke Mmadụ.

Luke 17:26 (UKJV) And as it was in the days of Noe, so shall it be also in the days of the Son of man.

24Nʼihi na Nwa nke Mmadụ nʼụbọchị ya ga-adị ka amụma nke eluigwe nke na-enye ìhè na mbara eluigwe site nʼotu ebe ruo nʼebe nke ọzọ.

25Ma ọ ghaghị ibu ụzọ hụọ ọtụtụ ahụhụ, ọgbọ a ga-ajụkwa ya.

26“Dị ka ọ dị nʼụbọchị Noa, otu a ka ọ ga-adịkwa nʼụbọchị Nwa nke Mmadụ.

27Ha nọ na-eri na-aṅụ, na-alụ nwunye na-ekekwa ụmụ ha di, ruo mgbe Noa banyere nʼụgbọ mmiri. Oke iju mmiri ahụ bịakwara laa ha nʼiyi.

28“Otu a ka ọ dịkwa nʼoge Lọt. Ha nọ na-eri, na-aṅụ, na-azụrịtakwa ahịa, na-akụ mkpụrụ, na-arụkwa ụlọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.