29Ma nʼụbọchị ahụ Lọt si nʼobodo Sọdọm pụta, ọkụ na nkume dị ọkụ sitere nʼeluigwe zoo ka mmiri, laa ha niile nʼiyi.
30“Otu a ka ọ ga-adịkwa nʼụbọchị a ga-eme ka Nwa nke Mmadụ pụta ìhè.
31Nʼụbọchị ahụ, onye ọbụla nọ nʼelu ụlọ, ma ihe ya dị nʼime ụlọ, arịtukwala ịba nʼime ụlọ iburu ngwongwo ndị ahụ. Nʼotu aka ahụ, onye ọbụla nọ nʼubi, ya ghara ịlọghachita.
32Chetakwanụ nwunye Lọt.
33Onye ọbụla chọrọ iche ndụ ya nche ka ọ ga-efunarị, ma onye ọbụla na-atụfu ndụ ya ga-echebe ya.