5Ndị ozi ya sịrị ya, “Onyenwe anyị, mee ka okwukwe anyị dị ukwuu!”
6Onyenwe anyị zara, “Ọ bụrụ na unu nwere okwukwe nke ha ka mkpụrụ mọstaadị, unu nwere ike ị sị osisi ukwu a, Ka e site na mgbọrọgwụ hopu gị ma kụọkwa gị nʼime oke osimiri, ọ ga-erubere unu isi.
7“Ọ bụ onye nʼime unu nke nwere ohu onye si ebe ọ gara rụọ ọrụ maọbụ ịzụ atụrụ lọbata, ga-asị ya, ‘Mee ngwangwa nọdụ ala rie nri’?
8Ọ gaghị asị ya, ‘Siere m nri ọsịịsọ, kwadoo onwe gị jere m ozi ka m na-eri na aṅụkwa ihe ọṅụṅụ; emesịa ị ga-eri nri ma ṅụọ ihe ọṅụṅụ nke gị’?
9Ọ ga-ekele ohu ahụ nʼihi na ọ rụrụ ọrụ o kwesiri ịrụ?