1Mgbe ahụ ọ tụụrụ ha ilu a iji gosi ha mkpa ọ dị ikpe ekpere na-esepụghị aka,
2ọ sịrị, “O nwere otu ọkaikpe bi nʼotu obodo ma ọ naghị atụ egwu Chineke. Ọ naghị asọpụkwara mmadụ.
3Nʼobodo ahụkwa, e nwere otu nwanyị di ya nwụrụ anwụ nke na-abịakwute ya, na-asị ya, ‘Kpepụta m nʼaka ndị na-emegide m.’