Luk 18

Onye Farisii ahụ guzoro ọtọ kpee ekpere banyere onwe ya sị, ‘Chineke nna m, ana m ekele gị nʼihi na adịghị m ka mmadụ ndị ọzọ ndị na-apụnara mmadụ ihe ya nʼike, maọbụ ndị ajọ omume, maọbụ ndị na-akwa iko, ma ọ bụkwanụ dị ka onye ọna ụtụ a.

Luke 18:11 (UKJV) The Pharisee stood and prayed thus with himself, God, I thank you, that I am not as other men are, extortionists, unjust, adulterers, or even as this publican.

9Ọ tụkwara ilu a nʼihi ndị tụkwasịrị obi nʼonwe ha na ha bụ ndị ezi omume ma na-eleda ndị ọzọ anya.

10“Ụmụ nwoke abụọ rigoro nʼụlọnsọ ukwu ikpe ekpere, otu onye nʼime ha bụ onye Farisii, onye nke ọzọ bụ onye ọna ụtụ.

11Onye Farisii ahụ guzoro ọtọ kpee ekpere banyere onwe ya sị, ‘Chineke nna m, ana m ekele gị nʼihi na adịghị m ka mmadụ ndị ọzọ ndị na-apụnara mmadụ ihe ya nʼike, maọbụ ndị ajọ omume, maọbụ ndị na-akwa iko, ma ọ bụkwanụ dị ka onye ọna ụtụ a.

12Ana m ebu ọnụ ugboro abụọ nʼizu ụka ọbụla. Ana m akwụkwa otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe niile m nwetara.’

13“Ma onye ọna ụtụ ahụ guzo nʼebe dị anya, o nwekwaghị ike iweli ihu ya elu lee anya nʼeluigwe. Kama, ọ na-eti aka nʼobi ya na mwute na-asị, ‘Chineke, biko mere m ebere nʼihi na abụ m onye mmehie.’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.