15Ndị mmadụ na-ekutere ya ụmụntakịrị ka o bikwasị ha aka. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, ha baara ha mba.
16Ma Jisọs kpọrọ ha ka ha bịakwute ya, sị, “Kweenụ ka ha bịakwute m, unu egbochikwala ha, nʼihi na alaeze Chineke bụ nke ndị dị ka ha.
17Nʼezie, agwa m unu, onye ọbụla na-agaghị anara alaeze Chineke dị ka nwantakịrị agaghị aba nʼime ya.”
18Otu onye ọchịchị jụrụ ya sị, “Ezi onye ozizi, ọ bụ gịnị ka m ga-eme keta ndụ ebighị ebi.”
19Jisọs sịrị ya, “Gịnị mere i ji akpọ m ezi mmadụ? Ọ dịghị onye ọbụla bụ ezi mmadụ ma ọ bụghị naanị Chineke.