19Jisọs sịrị ya, “Gịnị mere i ji akpọ m ezi mmadụ? Ọ dịghị onye ọbụla bụ ezi mmadụ ma ọ bụghị naanị Chineke.
20Ị maara ihe niile enyere nʼiwu, akwala iko, egbula mmadụ, ezula ohi, agbala ama ụgha, sọpụrụ nne na nna gị.”
21Ọ sịrị, “Edebezuchaala m iwu ndị a niile site na mgbe m bụ nwata.”
22Mgbe Jisọs nụrụ nke a, ọ sịrị ya, “Otu ihe fọdụrụ ka ime: ree ihe niile i nwere, kesara ụmụ ogbenye ego ya. Ị ga-enwe akụ nʼeluigwe, bịazie soro m.”
23Mgbe ọ nụrụ nke a, o wutere ya nke ukwuu, nʼihi na ọ bụ onye nwere ọtụtụ akụ.