27Ọ sịrị, “Ihe mmadụ na-apụghị ime, bụ ihe Chineke pụrụ ime.”
28Mgbe ahụ Pita sịrị, “Lee, anyị ahapụla ihe niile anyị nwere soro gị!”
29Ọ sịrị ha, “Nʼezie, agwa m unu, o nweghị onye ọbụla hapụrụ ụlọ ya, maọbụ nwunye, maọbụ ụmụnne, maọbụ ndị mụrụ ya, maọbụ ụmụntakịrị ya, nʼihi alaeze Chineke
30nke na-agaghị anata ihe ndị a nʼọgbọ a, nwekwa ndụ ebighị ebi nʼọgbọ nke na-abịa.”
31Jisọs kpọpụrụ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya nʼakụkụ, gwa ha sị, “Anyị na-aga Jerusalem, ihe niile ndị amụma dere banyere Nwa nke Mmadụ ga-emezu.