5Ma nʼihi na nwanyị a di ya nwụrụ anwụ nọgidere na-enye m nsogbu, aga m ahụ na o nwetara ikpe ziri ezi, ka ọ kwụsị inye m nsogbu site na ọbịbịa ọ na-abịa.’ ”
6Ya mere Onyenwe anyị sịrị, “Gerenụ ihe ọkaikpe nke na-eme ajọ omume na-ekwu.
7Ọ bụ na Chineke agaghị ekpepụta ndị ahụ ọ họpụtara, bụ ndị na-akpọku ya ehihie na abalị? Ọ ga-anọ tee anya nʼinyere ha aka?
8Asị m unu, ọ ga-eme ngwangwa hụ na ha nwetara ikpe ziri ezi. Ma otu ọ dị, mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa, ọ ga-ahụkwa ndị nwere okwukwe nʼime ụwa?”
9Ọ tụkwara ilu a nʼihi ndị tụkwasịrị obi nʼonwe ha na ha bụ ndị ezi omume ma na-eleda ndị ọzọ anya.