Luk 18

Asị m unu, ọ ga-eme ngwangwa hụ na ha nwetara ikpe ziri ezi. Ma otu ọ dị, mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa, ọ ga-ahụkwa ndị nwere okwukwe nʼime ụwa?”

Luke 18:8 (UKJV) I tell you that he will avenge them speedily. Nevertheless when the Son of man comes, shall he find faith on the earth?

6Ya mere Onyenwe anyị sịrị, “Gerenụ ihe ọkaikpe nke na-eme ajọ omume na-ekwu.

7Ọ bụ na Chineke agaghị ekpepụta ndị ahụ ọ họpụtara, bụ ndị na-akpọku ya ehihie na abalị? Ọ ga-anọ tee anya nʼinyere ha aka?

8Asị m unu, ọ ga-eme ngwangwa hụ na ha nwetara ikpe ziri ezi. Ma otu ọ dị, mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa, ọ ga-ahụkwa ndị nwere okwukwe nʼime ụwa?”

9Ọ tụkwara ilu a nʼihi ndị tụkwasịrị obi nʼonwe ha na ha bụ ndị ezi omume ma na-eleda ndị ọzọ anya.

10“Ụmụ nwoke abụọ rigoro nʼụlọnsọ ukwu ikpe ekpere, otu onye nʼime ha bụ onye Farisii, onye nke ọzọ bụ onye ọna ụtụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.