40Ọ zara sị, “Ka m gwa unu, ọ bụrụ na ha agbaa nkịtị, nkume ndị a ga-eti mkpu.”
41Mgbe ọ rutere Jerusalem nso, ebe ọ nọ hụzie obodo ahụ anya nke ọma. Ọ bere akwa nʼihi ya,
42sị, “Ọ bụrụ na ị maara taa, ọ bụladị gị onwe gị, ihe ndị na-eweta udo! Ma ugbu a, ezofuola ha nʼanya gị.
43Oge na-abịa mgbe ndị iro gị ga-agba gị gburugburu, mechie ụzọ mgbapụ niile, sitekwa nʼụzọ niile dị iche iche bịakwasị gị.
44Ha ga-egwepịa gị nʼala, gị na ụmụ gị nọ nʼime mgbidi a, ọ dịkwaghị nkume ọbụla ha ga-ahapụ nʼelu ibe ya, nʼihi na ị mataghị oge nleta Chineke nye gị.”