39Ụfọdụ nʼime ndị Farisii so igwe mmadụ ahụ gwara ya, “Onye ozizi, gwa ndị na-eso ụzọ gị ka ha mechie ọnụ!”
40Ọ zara sị, “Ka m gwa unu, ọ bụrụ na ha agbaa nkịtị, nkume ndị a ga-eti mkpu.”
41Mgbe ọ rutere Jerusalem nso, ebe ọ nọ hụzie obodo ahụ anya nke ọma. Ọ bere akwa nʼihi ya,
42sị, “Ọ bụrụ na ị maara taa, ọ bụladị gị onwe gị, ihe ndị na-eweta udo! Ma ugbu a, ezofuola ha nʼanya gị.
43Oge na-abịa mgbe ndị iro gị ga-agba gị gburugburu, mechie ụzọ mgbapụ niile, sitekwa nʼụzọ niile dị iche iche bịakwasị gị.