17Mgbe ha hụrụ nke a, ha mere ka a mata ihe niile a gwara ha banyere nwantakịrị a.
18Ihe ndị ọzụzụ atụrụ a kwuru juru ndị niile nụrụ ya anya.
19Ma Meri debere ihe ndị a niile nʼobi ya, na-atụgharị ihe banyere ha nʼobi ya.
20Ndị ọzụzụ atụrụ ahụ laghachiri, na-eto Chineke na-ebulikwa aha ya elu nʼihi ihe niile ha nụrụ ma hụkwa, nke dịkwa ka a gwara ha.
21Mgbe ụbọchị asatọ gasịrị, mgbe oge ruru ibi nwata ahụ ugwu, ha gụkwara ya aha. Aha ha nyere ya bụ Jisọs, aha ahụ mmụọ ozi nyere tupu a dị ime ya.