15Mgbe ndị mmụọ ozi ahụ hapụrụ ha, laghachi nʼeluigwe, ndị ọzụzụ atụrụ ahụ sịrịtara onwe ha, “Bịanụ ka anyị jeruo Betlehem, ka anyị jiri anya anyị hụ ihe ndị a merenụ, nke Onyenwe anyị mere ka anyị mara.”
16Ha gara ọsịịsọ hụ Meri na Josef, na nwata ahụ ka o dina nʼime ebe a na-enye anụ ụlọ nri.
17Mgbe ha hụrụ nke a, ha mere ka a mata ihe niile a gwara ha banyere nwantakịrị a.
18Ihe ndị ọzụzụ atụrụ a kwuru juru ndị niile nụrụ ya anya.
19Ma Meri debere ihe ndị a niile nʼobi ya, na-atụgharị ihe banyere ha nʼobi ya.