22Mgbe oge zuru maka mmemme nke ịdị ọcha dị ka iwu Mosis siri dị, ha kutere ya na Jerusalem iche ya nʼihu Onyenwe anyị
23(dịka e dere ya nʼiwu nke Onyenwe anyị, “Nwa mbụ ọbụla nke bụ nwoke ka a ga-edo nsọ nye Onyenwe anyị”),
24ha chụrụ aja dị ka e nyere nʼiwu Onyenwe anyị: “Ụmụ kpalakwukwu abụọ maọbụ ụmụ nduru abụọ.”
25Ma lee, e nwere otu nwoke bi na Jerusalem aha ya bụ Simiọn, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ. Ọ bụ onye ezi omume bụrụkwa onye ji obi ya niile na-efe Chineke. Ọ bụkwa onye na-ele anya maka nkasiobi nke ndị Izrel.
26Ma Mmụọ Nsọ Chineke mere ka ọ mata na ọ gaghị anwụ ruo mgbe ọ hụrụ Kraịst nke Onyenwe anyị.