38Nʼoge ahụ ọ bịarutere nʼebe ha nọ, nye Chineke ekele, kwuo okwu banyere nwantakịrị ahụ nye ndị niile na-ele anya maka mgbapụta Jerusalem.
39Mgbe ha mesịrị ihe niile otu ọ dị nʼiwu Onyenwe anyị, ha laghachiri obodo ha bụ Nazaret nke dị nʼime Galili.
40Ma nwata ahụ toro bụrụ onye dị ike; o jupụtara nʼamamihe, amara Chineke dịnyekwaara ya.
41Nʼafọ niile, ndị mụrụ ya na-aga Jerusalem nʼihi Mmemme Ngabiga.
42Mgbe o ruru afọ iri na abụọ, ha gara maka mmemme dị ka omenaala si dị.