39Mgbe ha mesịrị ihe niile otu ọ dị nʼiwu Onyenwe anyị, ha laghachiri obodo ha bụ Nazaret nke dị nʼime Galili.
40Ma nwata ahụ toro bụrụ onye dị ike; o jupụtara nʼamamihe, amara Chineke dịnyekwaara ya.
41Nʼafọ niile, ndị mụrụ ya na-aga Jerusalem nʼihi Mmemme Ngabiga.
42Mgbe o ruru afọ iri na abụọ, ha gara maka mmemme dị ka omenaala si dị.
43Mgbe e mesịrị mmemme ahụ, ka ndị mụrụ ya na-alaghachi, nwata ahụ bụ Jisọs nọdụrụ na Jerusalem. Ndị ha amataghị na o soghị ha na-alọta.