6Mgbe ha nọ ebe ahụ, oge ọ ga-eji mụọ nwa ya zuru.
7Ọ mụrụ nwa nwoke mbụ ya. O ji akwa kee ya, nibe ya nʼime ebe a na-enye anụ ụlọ nri, nʼihi na ha enwetaghị ebe ndina nʼụlọ ndị ije.
8Ma e nwere ndị ọzụzụ atụrụ bi nʼọhịa nʼakụkụ ebe ahụ, ndị na-eche igwe atụrụ ha nche nʼabalị.
9Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị pụtara ihe nye ha. Ebube Onyenwe anyị mụwara gburugburu ha, oke egwu tụrụ ha.
10Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ha, “Unu atụla egwu. Ana m ewetara unu oziọma nke oke ọṅụ nke ga-adịrị mmadụ niile.