4Ya mere Josef hapụrụ Nazaret nke dị na Galili, gaa Betlehem nke dị na Judịa, nke bụkwa obodo Devid, nʼihi na o si nʼụlọ na agbụrụ Devid pụta.
5Ya na Meri, nwaagbọghọ o kwere nkwa ịlụ, nke dịkwa ime, soro gaa ka o denye aha ha.
6Mgbe ha nọ ebe ahụ, oge ọ ga-eji mụọ nwa ya zuru.
7Ọ mụrụ nwa nwoke mbụ ya. O ji akwa kee ya, nibe ya nʼime ebe a na-enye anụ ụlọ nri, nʼihi na ha enwetaghị ebe ndina nʼụlọ ndị ije.
8Ma e nwere ndị ọzụzụ atụrụ bi nʼọhịa nʼakụkụ ebe ahụ, ndị na-eche igwe atụrụ ha nche nʼabalị.