2(Nke a bụ ịgụ ọnụ na ide aha nke mbụ e mere mgbe Kwirinus bụ onye na-achị Siria.)
3Onye ọbụla gara nʼobodo ya, ka e denye aha ya nʼakwụkwọ.
4Ya mere Josef hapụrụ Nazaret nke dị na Galili, gaa Betlehem nke dị na Judịa, nke bụkwa obodo Devid, nʼihi na o si nʼụlọ na agbụrụ Devid pụta.
5Ya na Meri, nwaagbọghọ o kwere nkwa ịlụ, nke dịkwa ime, soro gaa ka o denye aha ha.
6Mgbe ha nọ ebe ahụ, oge ọ ga-eji mụọ nwa ya zuru.