15Ya mere, ha kpụfere ya nʼazụ ubi vaịnị ahụ, gbuo ya. “Gịnị ka onye nwe ubi ahụ ga-eme ha?
16Ọ ga-abịa, laa ndị ahụ na-elekọta ubi ahụ nʼiyi, were ubi vaịnị ahụ nye ndị ọzọ.” Mgbe ndị ahụ nụrụ nke a, ha sịrị, “Chineke ekwela.”
17O legidere ha anya sị, “Gịnịkwa ka unu chere na ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ pụtara, “ ‘Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ aghọọla nkume nke isi ntọala ụlọ’ ?
18Onye ọbụla nke dakwasịrị nʼelu nkume ahụ, ka a ga-etiwasị, ma onye ọbụla ọ dakwasịrị, ka ọ ga-egwepịa.”
19Ndị ozizi iwu na ndịisi nchụaja chọrọ ụzọ ha ga-esi jide ya nʼotu oge ahụ nʼihi na ha matara na ọ bụ ha ka o bu nʼobi tụọ ilu ahụ, ma ha tụrụ egwu ndị mmadụ.