29Ọ tụụrụ ha ilu a, “Leenụ osisi fiig na osisi ndị ọzọ niile anya.
30Mgbe ha bidoro ipupụta ahịhịa ọhụrụ, unu na-amata na ọkọchị adịla nso.
31Nʼụzọ dị otu a kwa, mgbe unu hụrụ ihe ndị a niile ka ha na-eme, matanụ na alaeze Chineke adịla nso.
32“Nʼezie agwa m unu, ọgbọ a agaghị agabiga tupu ihe ndị a niile emezuo.
33Eluigwe na ụwa ga-agabiga, ma okwu m enweghị ike ịgabiga.