31Nʼụzọ dị otu a kwa, mgbe unu hụrụ ihe ndị a niile ka ha na-eme, matanụ na alaeze Chineke adịla nso.
32“Nʼezie agwa m unu, ọgbọ a agaghị agabiga tupu ihe ndị a niile emezuo.
33Eluigwe na ụwa ga-agabiga, ma okwu m enweghị ike ịgabiga.
34“Kpachapụkwanụ anya, unu ekwela ka e bogbuo obi unu site nʼoke oriri na ọṅụṅụ na nchekasị nke ndụ a, site otu a mee ka ụbọchị ahụ bịakwasị unu na mberede, dị ka ọnya.
35Nʼihi na ọ ga-abịakwasị ndị niile bi nʼelu ụwa.